2 Kings 12:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n'ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n'obi nwoke ọ bula iwebata n'ulo Jehova,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Joash sịrị ndị nchụaja, “Nakọtaanụ ego niile a na-ewebata dịka onyinye dị nsọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya bụ, ego a na-anakọta nʼoge ịgụ mmadụ ọnụ, na ego e webatara maka imezu nkwa ndị mmadụ kwere, na ego e webatara nʼụlọnsọ ukwu dịka onyinye afọ ofufe.