2 Kings 12:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Eze, bú Jehoash, we kpọ Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa ndi-nchu-àjà ọzọ, si ha, Gini mere unu emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike? ma ub͕u a unu anarala ego n'aka ndi unu mara, kama nyenu ya ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, eze Joash kpọrọ Jehoiada, onye nchụaja, kpọkwaa ndị nchụaja ndị ọzọ jụọ ha, “Gịnị mere unu emezibeghị ụlọnsọ a? Site ugbu a gaa nʼihu, unu esitekwala nʼaka ndị na-eche ego anara ego ọzọ, kama, nyefeenụ ya maka iji dozie ụlọnsọ ukwu ahụ.”