2 Kings 15:30 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya, n'arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.