2 Kings 16:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Eze, bú Ehaz, we je izute Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, na Damaskọs, we hu ebe-ichu-àjà nke di na Damaskọs: eze, bú Ehaz, we zigara Uraija, bú onye-nchu-àjà, oyiyi ebe-ichu-àjà ahu, na ihe-atù-ya, dika ọlu nile aluru ya si di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe eze Ehaz gara Damaskọs izute Tiglat-Pilesa bụ eze Asịrịa. Ọ hụrụ otu ebe nchụaja nke dị na Damaskọs. O zigaara Ụraya onye nchụaja oyiyi ebe ịchụ aja ahụ. O dekwara ihe gbasara ya nʼakwụkwọ, nke ga-akọwa otu e si ewu ya.