2 Kings 17:26 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we gwa eze Asiria okwu, si, Mba ndi i mere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi i mere ka ha biri n'obodo Sameria, ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu: O we zìe ọdum n'etiti ha, ma, le, ha nēme ka ha nwua, n'ihi na ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.”