2 Kings 17:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we nēme, mba ọ bula chi nke aka ya, ha we dọba ha n'ulo nke ebe di elu nke ndi Sameria mere, mba ọ bula n'obodo-ha ebe ha onwe-ha nēbi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu.