2 Kings 17:34 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n'iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n'iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel.