2 Kings 18:14 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Hezekaia, bú eze Juda, we zigara eze Asiria ozi rue Lekish, si, Emehiewom; si n'ebe m'nọ laghachi: ihe i gēbom m'gēburu ya. Eze Asiria we tukwasi Hezekaia, bú eze Juda, ọgu talent ọla-ọcha iri-na-ise na orú talent ọla-edo na iri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Hezekaya chọrọ ụzọ ọ ga-esi mee udo, zie ozi zigara eze Asịrịa nʼobodo Lakish sị ya, “Emehiela m, biko, site nʼala m pụọ. Aga m akwụ gị ihe ọbụla ị chọrọ nʼaka m.” Eze Asịrịa sitere nʼaka Hezekaya eze Juda nara narị talenti ọlaọcha atọ, na iri talenti ọlaedo atọ.