2 Kings 18:32 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
rue mb͕e m'biara chiri unu je n'ala dika ala-unu, bú ala ọka na manya-vine ọhu, ala achicha na ubi-vine, ala manu olive na manu-aṅu, ka unu we di ndu, ghara inwu: unu ege-kwa-la Hezekaia nti, mb͕e ọ nārafu unu, si, Jehova gānaputa ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị, ala mmanụ aṅụ na osisi oliv jupụtara nʼime ya. Họrọnụ ndụ ka unu ghara ịnwụ. “Unu egela Hezekaya ntị, nʼihi na ọ bụ nrafu ka ọ na-arafu unu mgbe ọ na-asị, ‘ Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’