2 Kings 2:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri, bú ndi-dìnkpà, nọ n'etiti ndi-orù-gi n'ebe a; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tuda ya n'otù ugwu, ma-ọbu n'otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezigala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha sịrị ya “Lee, anyị bụ ndị ohu gị nwere iri ndị ikom ise ahụ siri ike. Kwere ka ha ga chọgharịa nna gị ukwu. Ma eleghị anya mmụọ Onyenwe anyị eburula ya tụdakwa ya nʼotu ugwu, maọbụ nʼotu ndagwurugwu.” Ịlaisha zaghachiri, “Unu ezigala ha.”