2 Kings 2:23 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O si n'ebe ahu rigorue Bet-el: ma mb͕e ya onwe-ya nārigo n'uzọ, umu-okoro siri n'obodo puta, we kwa ya emò, si ya, Rigo, onye-isi-nkwọcha; rigo, onye-isi-nkwọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”