2 Kings 22:13 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n'ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n'ihi ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị m, na Juda niile, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a nke a chọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke na-ere ọkụ megide anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ erubeghị isi nʼokwu nke akwụkwọ iwu a, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime ya banyere anyị.”