2 Kings 23:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O me-kwa-ra ka inyinya nile kwusi, bú nke ndi-eze Juda nyere anyanwu, nime nbata ulo Jehova, n'akuku ime-ulo Netan-melek, bú onozi, nke di n'èzí ulo ahu; o sure-kwa-ra ub͕ọ-ala nile nke anyanwu n'ọku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ.