2 Kings 23:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Eze we rigorue ulo Jehova, ya na ndikom nile nke Juda, na ndi nile ndi bi na Jerusalem, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi Juda nile, site n'onye ntà we rue onye uku: o we gua na nti-ha okwu nile nke akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu nke achọtaworo n'ulo Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị amụma niile, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.