2 Kings 23:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọzọ kwa, ndi nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa, na teraphim, na arusi nile, na ihe-árú nile nke ahuru n'ala Juda, na nime Jerusalem, ndia ka Josaia tkpochapuru, ka o we me ka okwu nile nke iwu guzosie ike, bú nke edeworo n'akwukwọ nke Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, chọtara n'ulo Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ Onyenwe anyị.