2 Kings 24:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n'ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O bupụkwara puku ndị ikom iri site na Jerusalem bulaa ha Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha. Ndị so nʼime ndị a bụ ndịisi niile na ndị agha niile. O bupụkwara ndị na-akwa ǹka niile na ndị ọkpụ ụzụ. Naanị ndị na-enweghị ike, na ndị ogbenye ka ọ hapụrụ nʼala ahụ.