2 Kings 25:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ndi ala ahu nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru eze Babilon, na ndi fọduru n'etiti igwè madu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri n'ala ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buuru ụfọdụ mmadụ ndị fọdụrụ nʼobodo, na ndị niile fọdụkwara, ha na ndị ọzọ ahụ ji aka ha gbakwuru eze bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.