2 Kings 3:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Jehoshafat, eze Juda, jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na o nweghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị ga-esi nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase, site na ya?” Otu onyeisi agha ndị Izrel sị ha, “Ịlaisha, nwa Shafat, onye jeere Ịlaịja ozi, nọ nʼebe a.”