2 Kings 4:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N'etiti ndim ka mu onwem nēbi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ ” Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.”