2 Kings 4:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.” Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.