2 Kings 5:14 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.