2 Kings 8:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Eze, bú Joram, we lata ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u ndi Siria tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Joram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.