2 Kings 8:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Hazael we je izute ya, were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-ya, bú ezi ihe nile nke Damaskọs, ibu ọgu camel abua gēbu, o we bia guzo n'iru ya, si, Nwa-gi, bú Ben-hedad eze Siria, ezìwom biakute gi, si, M'gādiri n'ọria nka?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”