2 Kings 9:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were karama manu a n'aka-gi, je Remot-gilead.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.