2 Kings 9:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ bia, ma, le, ndi-isi usu-ndi-agha nanọdu ala; ọ si, Enwerem okwu igwa gi, onye-isi. Jihu we si, Ọ̀ bu onye nime ayi nile? Ọ si, Ọ bu gi, onye-isi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”