2 Peter 1:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chineke esitela nꞌike ya nye anyị ihe nile dị anyị mkpa. O nyela anyị ihe ahụ ga-enyere anyị aka ibi ezi ndụ dị ka ndị ma onye Chineke bụ. Nꞌihi na ọ bụ ya kpọrọ anyị site nꞌebube ya na nꞌịdị mma ya.
Igbo 2006
dika ike O ji buru Chineke nyeworo n'aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n'efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.