2 Peter 1:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na anyị achọọ ịnata onyinye ndị a nile, anyị kwesịrị ime ihe karịrị ịtụkwasị Chineke obi nanị; anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ndị dị mma. Ma ịdị mma abụghị nanị ọrụ dịrị anyị. Anyị kwesịkwara ịga nꞌihu ịmụta ihe nile banyere Chineke. Ihe ọzọ anyị ga-atụkwasị nꞌelu ihe ọmụma bụ mmụọ nke emebigaghị ihe ọ bụla oke,
Igbo 2006
Ma n'ihi otù ihe a n'akuku-unu tukwasinu inu-ọku-n'obi nile, nyezu-kwa-nu idi-nma n'okwukwe-unu; nyezu kwa ihe-ọmuma n'idi-nma-unu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,