2 Peter 1:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe anyị na-aga nꞌihu na-eme ihe ndị a, mgbe ha jubigakwara oke nꞌime anyị, mgbe ahụ ka anyị ga-abụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nꞌihe anyị maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Igbo 2006
N'ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābughi ndi nādighi-alu ọlu ma-ọbu ndi nādighi-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.