2 Peter 2:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ana m eche na ndị ozizi ụgha a bụ ndị nzuzu. Ha na-eme ihe ọ bụla ha kpebiri nꞌobi ha. Ha dị ka ụmụ anụ ọhia ndị a na-amụ nanị nꞌihi ka ndị mmadụ gbuo ha rie. Lee ka ha si ekwulu ndị dị ike ha na-aghọtaghị ihe ọ bụla banyere. A ga-alakwa ha nꞌiyi, ha na mmụọ ọjọọ nile na ike nile nke ọkụ ala mmụọ.
Igbo 2006
Ma ndia, dika anu nēnweghi uche, ndi bu anu nzuzu site n'ọmumu-ha inwude na imebi, nēkwulu Chineke n'ihe ha nāmaghi, agēmebi kwa ndia na nmehie ha,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a.