2 Peter 2:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị ozizi ụgha ahụ nꞌihi mmehie ha. Nꞌihi na ihe na-atọ ha ụtọ bụ nanị ibi ndụ nke imejupụta ihe ọjọọ ahụ nile na-agụ anụ ahụ ha agụụ. Ha bụ ndị na-ewetara unu ihe ihere mgbe ọ bụla ha so unu na-eri oriri ịhụnanya unu, nꞌihi na nꞌotu akụkụ, ha na-ebi ndụ ajọ omume. Ma ha na-eso unu ezukọ dị ka a ga-asị nꞌezie, na ha bụ ndị dị ọcha nꞌobi ha.
Igbo 2006
ndi anēmejọ ha dika ugwọ-ọlu nke ajọ omume; madu ndi nāgu ya n'ihe-utọ, bú ibi n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'ehihie, ndi bu ntupọ na ihe-ita-uta, nānọ n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'oriri ihu-n'anya ha mb͕e ha nēso unu rikọ ihe;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A ga-eji ntaramahụhụ kwụghachi ha ụgwọ ihe ọjọọ ha mere. Ihe na-atọ ha ụtọ bụ ịkpọ oriri na ọṅụṅụ nʼetiti ehihie. Ha bụ ihe ihere, bụrụkwa ndị na-ewetara unu ntụpọ ma ọ bụrụ na ha na-eso unu na-erikọta oriri.