2 Peter 2:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O nweghị nwanyị si nꞌebe ha nọ gafee nke ha na-adịghị ele anya ọjọọ; mmehie ịkwa iko anaghị ejukwa ha afọ, nꞌihi na agụụ ime mmehie dị nꞌime ha adịghị akwụsị akwụsị. Ha maara otu ha si arafu ụmụ nwanyị ndị okwukwe ha na-esighị ike, mee ka ha soro ha mee mmehie. Ha na-azụ obi ha inwe anya ukwu. Nꞌezie, Chineke bụrụ ha ọnụ.
Igbo 2006
ha bu ndi nwere anya nke juputara n'aru nwanyi nākwa iko, anya nke nāpughi kwa ighara imehie; ha bu kwa ndi nārafu nkpuru-obi ndi nādighi-eguzosi ike; ha nwekwara obi anwaputaworo n'anya-uku; buru kwa umu nke ọbubu-ọnu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.