2 Peter 2:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị ozizi ụgha a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọ bụla na-adịghị nꞌime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị nke na-adịghị ezo mmiri ọ bụla.
Igbo 2006
Ndia bu isi-iyi nke miri nādighi, buru kwa alulu nke oké ifufe nēfepu; ndi edebeworo ha itiri nke ọchichiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.