2 Peter 2:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha na-agwa ndị a ha na-eduhie okwu sị, “A zọpụtaghị unu nꞌihi ọrụ ọma unu rụrụ, ya mere ọ bụghị ihe ọjọọ ma unu gaa nꞌihu ime mmehie. Nꞌihi nzọpụta a zọpụtara unu, unu enwerela onwe unu, meenụ ihe ọ bụla dị unu mma nꞌanya.” Ma ndị ozizi a na-ezi ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi nwere onwe ha site nꞌiwu, bụ ohu mmehie na ịla nꞌiyi nꞌonwe ha. Nꞌihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọ bụla na-achị ya.
Igbo 2006
N'ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n'oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha.