2 Peter 2:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe mmadụ sitere nꞌụzọ ọjọọ nke ụwa gbapụ, nꞌihi na ọ mụtala ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ onye ọnọdụ ya ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na onye ahụ emesịa bido ime mmehie, nke ga-eme ka ọ ghọọ ohu mmehie.
Igbo 2006
N'ihi na asi na, mb͕e ha b͕anariworo ihe nile emeruru emeru nke uwa site na nmazu nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist, ewe nime ihe ndia, meri kwa ha, ọnọdu ikpe-azu ha abiawo jọkari ọnọdu mbu njọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.