2 Peter 2:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na ihe dị otu a emee, a ga-eji omume onye ahụ tụnyere ilu ndị a nke kwuru sị, “Nkịta gbọchaa agbọ, ọ laghachi rachaa ihe ọ gbọrọ.” “A sachaa ezi ahụ, ya eburu onwe ya tụnye nꞌunyi.”
Igbo 2006
Okwu nke ezi ilu ahu adakwasiwo ha, Ọ bu nkita nke chighariri ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, buru kwa nne-ezì nke chighariri ọzọ n'ituru n'apiti mb͕e ọ sachasiri onwe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ilu ndị a bụ eziokwu banyere ha sị, “Nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,” ya na, “Nne ezi a sachara ahụ laghachiri ọzọ ịtụrụ onwe ya nʼapịtị.”