2 Peter 3:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
mgbe anyị nọ na-ele anya ọbịbịa nke oke ụbọchị ahụ? Gbalịsiekwanụ ike isite na ndụ unu mee ka ụbọchị ahụ bịa ngwangwa, ụbọchị ahụ Chineke ga-eji ọkụ repịa eluigwe, mee ka ihe nile dị nꞌeluigwe gbazee bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.
Igbo 2006
nēle anya ọbibia nke ubọchi ahu nke Chineke, nēme kwa ka ọ bia ngwa ngwa, nke elu-igwe gēre ọku we la n'iyì n'ihi ya, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we b͕aze?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.