2 Peter 3:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chetakwanụ ihe mere Onyenwe anyị adịghị eme ngwangwa ịlọghachi. Ọ na-enye anyị ohere ime ka ndị ọzọ nata ozi ọma ahụ ga-ewetara ha nzọpụta. Nwanna anyị Pọl ejirila amamihe Chineke nyere ya dee ihe banyere okwu a nꞌọtụtụ akwụkwọ ozi ọ na-ede. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta. Ma ọ bụ nꞌụdị okwu a ka a na-ahụ ọtụtụ ndị nzuzu, ndị na-akọwa okwu ndị a dị ka ha si chepụta nꞌobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere isi, mee ka a ghọta okwu ndị a nꞌụzọ na-abụghị ụzọ Pọl onye dere ha chọrọ ka anyị ghọta ha. Nke a bụkwa ihe ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ si otu a na-ewetara onwe ha ịla nꞌiyi.
Igbo 2006
Nāgu-kwa-nu ogologo-ntachi-obi Onye-nwe-ayi na ọ bu nzọputa; dika nwa-nna-ayi ayi huru n'anya, bú Pọl, dega-kwa-ra unu n'akwukwọ, dika amam-ihe enyere ya si di;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya.
Recommended Reading