2 Peter 3:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Lee ụdị ihe ha ga-agwa unu, “Jisọs ò kwere unu nkwa na ọ ga-alọghachi ọzọ? Olee kwanụ ya? O nweghị nke ọ na-abịa! Leenụ kemgbe nna nna anyị ha biri ndụ nwụọ, ihe nile dịkwa otu ha dị site na mgbe e kere ụwa. Ọ dịghị ihe mgbanwe ọ bụla dị.”
Igbo 2006
nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”