2 Peter 3:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị na-ekwu ụdị okwu a kpachaara anya chefuo na Chineke onye sitere nꞌokwu ọnụ ya kee eluigwe na ụwa, bụkwa onye mere ka e jiri mmiri dị ukwuu laa ụwa mbụ ahụ nꞌiyi nꞌoge gara aga. Ọ bụ otu Chineke ahụ mere ka e sitekwa na mmiri kpụpụta ala akọrọ na ihe nile gbara ya gburugburu.
Igbo 2006
N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu.