2 Samuel 10:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri-na-ise, na orú nnú ndi-inyinya uzọ ise; o tib͕u-kwa-ra Shobak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, o we nwua n'ebe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ.