2 Samuel 11:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid we kpọ ya, o we rie ihe n'iru ya, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; Devid we me ya ka ọ ṅubiga manya okè: o we pua n'anyasi idina n'ihe-ndina-ya n'etiti ndi-orù onye-nwe-ya, ma ọ ridaghi rue ulo-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi.