2 Samuel 12:30 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya; ọtùtù-ya bu otù talent ọla-edo, nkume di oké ọnu-ahia di kwa ya; o we di n'isi Devid. O weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.