2 Samuel 12:31 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o tiye ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike ígwè, me kwa ka ha gabiga n'ihe eji akpu brick: otú a ka ọ nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.