2 Samuel 13:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Amnon we si Tema, Bubata ihe-oriri n'ime-ulo, ka m'we rie ya n'aka-gi. Tema we chiri achicha nke o mere, chitara Amnon nwa-nne-ya n'ime-ulo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị.