2 Samuel 14:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n'uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.”