2 Samuel 15:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Absalom we bilie n'isi-ututu, guzo n'akuku uzọ ọnu-uzọ-ama: o rue, mb͕e nwoke ọ bula nwere okwu nke gēru eze nti ka o we kpe ya, na Absalon kpọro ya, si, Òle obodo gi onwe-gi si bia? Ọ si, Otú nime ebo Israel ka orù-gi si bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.”