2 Samuel 15:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Itai we za eze, si, Jehova nādi ndu, onye-nwem, bú eze, nādi kwa ndu, n'ezie n'ọnọdu ebe onye-nwem, bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu ọnwu ma-ọbu idi ndu, n'ezie n'ebe ahu ka orù-gi gānọ kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.”