2 Samuel 15:27 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n'obodo n'udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo.