2 Samuel 15:32 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n'elu isi-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.