2 Samuel 16:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid we gabiga elu nrigo nke-ntà, ma, le, Ziba, onye nējere Mefiboshet ozi, zutere ya, chiri inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa, ọgu ob͕e achicha iri di kwa n'elu ha, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu nkpuru mb͕e okpom-ọku ise, na otù karama-akpukpọ manya-vine.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya.